Download as docx, pdf, or txt
Download as docx, pdf, or txt
You are on page 1of 21

Name:……………………………………………………………………………CLASS:……………..……………………..

DEEPER LIFE HIGH SCHOOL

FIRST TERM: E-LEARNING NOTES

JS 1 (BASIC 7)

IGBO LANGUAGE (ASUSU IGBO)

WEEK TOPIC

1-2. Njirimara na oru asusu :(A)Njirimara asusu dika(i)Mmekorita di n’etiti mmadu na ibe ya
site n’okwu onu,(ii)asusu nwere ebe a na-asu ya(B)uru asusu bara:(i)iji ama mba maobu
agburu(ii) iji eziputa omenala na agumagu mba

3-4. Nkowa ndi bu ndi Igbo na asusu ha(A)Ebe di iche iche bu ala igbo na Naijiria(B)ndi Igbo
na ndi agbataobi ha(C)akuko di iche iche gbasara ebe ha siri malite(D)ihe ndi ozo e jiri
mara ndi Igbo dika:ejiji,egbugbu dg.

5-6. Udaasusu Igbo na Nsoroedide Igbo(i)Mkpuru edemede Igbo(abidii)

(ii) Abidii Igbo Obere na nnukwu,udaume(iii)mgbochiume(iv)myiriudaume(v)Akara


edemede

7. Nrukorita oru na uru o bara(i)nkowa Nrukorita oru(ii)Nkowa usoro na iwu nrukorita


oru(iii)uru na oghom di na nrukorita oru.

8. Ahirimfe:

A.Nkowa ahirimfe B.ahirimfe nkwe na nju.

9. Mmeghari ihe ndi a muru

10. Ule.

11. Mmechi.
IZU NKE MBU – (WEEK 1) UBOCHI.

ISIOKWU. Njirimara na oru asusu. .

NDINISIOKWU.

o Ihe bu asusu na njirimara ya.


o Mmekorita asusu nwere na ebe a na-asu ya.
o Uru na oru asusu bara.
IHE BU ASUSU NA NJIRIMARA NA ORU YA:-

NDINAYA.

Asusu bu uzo mmadu na ibe ya si ekwurita okwu ma o bu akparita nkata. Nani mmadu na-asu
asusu.Obodo o bula nwere asusu e jiri mara ya. E wepu asusu e ji onu asu ,e nwere ihe ndi ozo e
ji eziputa ihe mmadu bu n’uche.Ha bu ekwe, ogene,oja,odi.Ihe ndi ozo e jikwa ezipute ihe
mmadu bu n’uche bu anya, aka,.ikoro dgz.

NJIRIMARA ASUSU

)O bu onu I ka- eji ekwupute ya. II) O bu mmadu ga-asu asusu ahu.

III)O ga – enwe nghota. IV) O gana – eto eto.. V) O ga – enwe usoro.

VI)O ga-ezu oke.

NNWALE.

i Gini bu asusu?

ii. Deputa njirimara ise gbasara asusu?.

ORU ULO

1 otu n’ime ndi a na-asu asusu…………………….(a) anumanu (b) osisi (c) mmiri (d)mmadu

2 Nke abughi njirimara asusu ebe a bu------(a)o ga enwe usoro (b) O gana – eto eto (c) O ga –
enwe nghota (d)o gana agba oso.

3 Ihe ndi ozo mmadu ji egosipute mbunuche ya bu------(a)igba boolu (b) iji anya (c)iyi akwa
(d)ite ofe.
4Mmekorita ------na ibe ya bu asusu mere ya ka o di mfe. (a)nwata (b)nwanyi (c)mmadu
(d)nwoke

TIORI

1Depute ihe ndi ozo mmadu ji ezipute ebumunuche ya.

AKWUKWO OGUGU—igbo junio sekondiri 1

IZU NKE ABUO (WEEK 2) UBOCHI

ISIOKWU---NJIRIMARA NA ORU ASUSU

NDINISIOKWU 1 MMEKORITA ASUSU NWERE NA EBE A NA ASU YA

2 URU NA ORU ASUSU BARA

MMEKORITA ASUSU NWERE NA EBE A NA ASU YA

.NDINAYA.

O bughi otu udidi asusu ka e nwere n’uwa a. Obodo o bula nwere asusu ejiri mara ha. Nke o
bula na ibe ya abughi otu mana nkowa ha na nghota ha bu otu. Ka anyi lebaa anya n’otutu
okwu na mputara ha n’asusu ndi ozo.

OKWU N’ASUSU DI ICHE ICHE

ASUSU BEKEE ASUSU YORUBA ASUSU IGBO A SUSU AWUSA

Bird Eye Nnunu Tsantsu

Hair Irun Ntutu Gash

Eat jeun Rie Ci


Moon osupa Onwa Wata

Table tabili Teburu Taburu

Spoon sibi ngaji Chokoli

Cloth aso Akwa Sutura

Children omode Umuaka Yaro

Enter wole Banye Shiga

No rara Mba A’a

Stop it da duro Kwusi ya Dakafa

Our house ile wa Ulo anyi Gidamu

Give me waterfumi ni omi Nyem mmiri Bani ruwa Come again


pada wa Bia ozo Kaza kuma

Read your book ka iwe re Guo akwukwo gi Karanta lita finka


Teach us kowa Kuziere anyi Ka koya mana

Udidi asusu e nwere n’uwa.

ASUSU UFODU NDI NWE YA

Asusu Bekee Britain

Asusu Japanese Japan

‘ Greek Greece

“ Swahili Tanzania

“ German Germany

“ Arabic Saudi – Arabia

“ Portuguese Portugal

“ French France

“ Slav Russia

“ Turks Turkey

NNWALE.

1. Depute ufodu asusu e nwere n’ uwa a na obodo na-asu ya.

2. Depute ihe okwu ndi a putara n’asusu bekee, Yoruba na Awusa:- onwa, mba akwa, rie,
ngaji, nnunu
URU NA ORU ASUSU.

NDINAYA.

o Mmadu na ibe ya ji ya emekorita.


o Eji ya amata ihe di n’uwa
o Eji ya amata ebe onye obula siri puta.
o Eji ya akuzi ihe.
o Eji ya enwe mmuta.
o Eji ya eziputa omenaala.
o Eji ya amata obodo

NNWALE.

1. Asusu o bara uru?

2. Dee uru ise asusu bara?

IHE OGUGU:- Guo igbo junio Sekondiri 1 ihu nke mbu ruo n’ihu nke ise.

ORU ULO

1. Depute udidi asusu I maara (a)… (b) …… (c ) ….

2. Kedu ihe “banye” putara n’asusu.Hausa…… (a) A’ a (b) shiga (c ) wole (d) wata

3. Kedu ndi na-asu asusu swahili ….(a) Yoruba (b) Japan (c ) Tanzania (d) Russia

4. Otu n’ime ndi a na-asu asusu… (a) agwo (b) nkita (c ) mmadu (d) oche.

TIORI.\

1. Depute asusu iri e nwere na Naijiria.


2. Gosi uzo ise ozo mmadu nwere ike iji zipute ebumnuche ya.

IZU NKE ATO (WEEK 3) UBOCHI

Isiokwu--- Nkowa ndi bu ndi Igbo na asusu ha

NDINISIOKWU

-Ndi bu ndi Igbo-Ebe a na asu asusu Igbo

--Agbata obi ndi Igbo-

--Ebe ndi Igbo siri malite

-- Njirimara ndi Igbo

NDI BU NDI IGBO NA EBE A NA- ASU ASUSU IGBO.

NDINAYA

Ndi Igbo bu ndi ahu bi n’akuku owuwa anyanwu nke Naijiria.E jiri ife CHINEKE were mara ha. Ha
na asu asusu Igbo . Otutu n’ime ha na-eji oji. Ha huru azumahia n’anya. Ndi Igbo buru ibu ma
baa uba nke ukwu .Steeti e jiri mara ha bu;Enugu,Anambara, Imo ,Ebonyi Abia .Otutu obodo a
ga-enwete na ha bu—

Steeti---------Obodo

Enugu---- -Udi, Oji, Opi, Nsukka ,Oboloafor

Anambara--Oka, Onitsha , Oba ,Nnewi, Nnaka

Abia----- Umuahia, Aba ,Ngwa, Umudike

Ebonyi--- -Abakaliki, Afikpo, Izaa, Ohaozara

Imo--- -Owere, Orlu Osina, Mbaise,Mbaano

Ndi Igbo zonyere ukwu na steeti ndi gbara ha gburugburu .Steeti ndi a bu,Delta, Rivers, Akwa
ibom na cross river.

NNWALE

Kedu ndi bu ndi Igbo?


Depute steeti ndi Igbo ise?

STEETI NDI IGBO.

AGBATA OBI NDI IGBO

NDINAYA.

Asi na agbata obi onye bu nwanne ya.Ndi Igbo nwere ndi agbata obi di iche iche gbara ha gburu
gburu.Agbata obi ndi a bu ;

N’akuku ugwu (north)-Tivi, Igala, Idoma, Ukelle

Na ndida(south)-Ogoni , Ijaw,Abua

N’owuwa anyanwu(east)Efik ,Ibibio ,Ekajioku

N’odida anyanwu(west)-Isoko, Iduu,Urohbo


NNWALE

1 Depute agbata obi ndi Igbo ano n’akuku ugwu?

2 Gosi agbata obi ndi Igbo ato n’akuku odida anyanwu

ORU ULO

1 Kedu obodo adighi n’ala Igbo?-------(a)Oka (b)mbaise (c)Nri (d)Igala

2 Steeti ndi Igbo nwere nani ha bu------(a)Oyo (b)Kogi (c)Imo (d)Rivers

3 Otu n’ime ndi a bu agbata obi ndi Igbo n’akuku ugwu-----(a)Idoma (b)Iduu (c)Legosi (d)Ogoni

4 Ndi Igbo zonyere ukwu n’out steeti ndi a------(a)Kastina (b)Yobe (c)Delta (d)Ekiti.

IHE OGUGU---Igbo maka junio sekondiri nke mbu.


IZU NKE ANO (WEEK 4) UBOCHI

ISIOKWU-NKOWA NDI BU NDI IGBO NA ASUSU HA.

EBE NDI IGBO SIRI MALITE

Obodo o bula nwere akuko gbasara mmalite ha. Ndi Hausa malitere n’aka Bayagida.Ndi Yoruba
si n’aka Oduduwa.Mana ndi Igbo e nweghi out akuko a ga asi bu out ha siri malite. Ufodu ndi
oka mmuta kwuru otutu ihe gbasara ebe ndi Igbo siri malite .Ha bu;

1 Na ndi Igbo malitere n’akuku Nri

2 Na ndi Igbo bu ndi Juu

3 Na ndi Igbo malitere n’akuku Orlu

4 NA ndi Igbo bi ebe ha bi kemgbe uwa bidoro

5 Na ndi Igbo si n’akuku owuwa anyanwu nke Afirika

NNWALE

1Deputa obodo ise bu agbata obi ndi Igbo?

2Gosi ebe ato ndi Igbo siri malite?

NJIRIMARA NDI IGBO

NDINAYA

Ihe ndi a bu njirimara ndi Igbo

a, Asusu ha b. Iwa oji ha c, Isopuru mmadu d.Omenaala ha

e, Erimeri ha f, Ejiji ha g. Azumaahia h .Ije mba

I, Ikpere CHINEKE
EJIJI NDI IGBO

EGWU NDI IGBO

NNWALE

1 Depute njirimara ndi Igbo ise

2Depute njirimara ndi Igbo na adighi n’ebe a

Oru ulo

1 Nke bu nri ndi Igbo ebe a bu-----(a)shinkafa (b)tuwo (c)amala (d) ede

2 Otu n’ime ndi a abughi njirimara ndi Igbo—(a)Izu ahia (b)Ida mba n’oru (c)ejiji ha (d)asusu ha

3 Out omenaala e jiri mara ndi Igbo ebe a bu------(a)iwa ala (b)Ita aki (c) Iwa ji (d)ile anya

TIORI
Depute omenaala ndi Igbo ise

IHE OGUGU-Igbo junio sekondiri nke mbu.

IZU NKE ISE (WEEK 5) UBOCHI

ISIOKWU--- Udaasusu Igbo na Nsoroedide Igbo

NDINISIOKWU (i)Mkpuru edemede Igbo(abidii)

(ii) Abidii Igbo Obere na nnukwu

(ii),udaume(iii)mgbochiume

(iv)myiriudaume(v)Akara edemede

MKPURU EDEMEDE IGBO (IGBO ALPHABETHS)

NDINAYA;

Nke a bu abiidi eji ede asusu Igbo.Mkpuru edemede e ji ede Igbo taa bu nke Onwu komiti
weputere n’afo 1961.A na akpo ya Onwu otografi.E nwere nke obere na nke nnukwu

Mkpuru edemede nke obere;

a b ch d e f g gb gh

gw h i ! j k kp kw l

m n ń nw ny o o p r

s sh t u u v w y z

Mkpuru edemede nke nnukwu

A B CH D E F G GB GH

GW H I ! J K KP KW L

M N Ń NW NY O O P R

S SH T U U V W Y Z

Mkpuru edemede Igbo di iri ato na isii (36).O kere onwe ya uzo abuo; udaume na mgbochume

NNWALE;
Depute akara edemede Igbo nke obere

Abiidi Igbo di ole?

ORU ULO

1 Mkpuru edemede e ji ede Igbo taa bu nke Onwu komiti weputere n’afo --------

(a)1999 (b)1691 (c)1961 (d)2010

2Abiidi Igbo kere onwe ya uzo -------(a)isii (b)abuo (c)ise (d)ano

3 Mkpuruedemede eji ede Igbo ole-----(a)iri ato (b)iri isii (c)itoolu (d)iri ato na isii

4 A na- akpo mkpuru edemede Igbo------(a)Onwu otografi (b)Obi otografi (c)Eze otografi (d)ude
otografi

TIORI

Dee abiidi nke nnukwu.

IZU NKE ISII (WEEK 6) UBOCHI

ISIOKWU---UDAASUSU IGBO NA USORO ODIDE IGBO

NDINISIOKWU------UDAUME NA MGBOCHIUME

UDAUME NA MGBOCHIUME.

NDINAYA

UDAUME(VOWELS)

Udaume bu abiidi ndi ahu na-eme ka okwu Igbo nwee nghota .Ha di asato. Ha bu ;

A , E, I , I, O, O, U, U,

Udaume kere onwe ya uzo abuo ;udamfe na udaaro

Udamfe( light vowels) (otu A)-Ha bu ‘a’ na ndi nwere kpom n’ike.d.k a,o,u ,i

Udaaro(heavy vowels)(out E)-Ha bu ‘e’na ndi enweghi kpom n’ike d.k e,o, u .i

Udamfe Udaaro

a-aka,anya, anu e-eke,eze ,elu


i-igba, ita, inya i-ite ,isi, ije

o-onu,ocha,oku o-oche, ose,oge

u-ulo,uta,uka u-ube,ute,ude

NB Udamfe na udaaro anaghi ano n’otu okwu Igbo

MGBOCHIUME(CONSONANTS)

E wepuchaa udaume n’ime abiidi ,ndi ozo bu mgbochiume. Ha di iri abuo na asato. Ha bu;

B, CH, D, F, G, GB, GH, GW, H,

J, K, KP, KW, L, M, N, N, NW

NY, P, R, S, SH, T, V, W, Y, Z.

Mgbochiume kere onwe ya uzo abuo;mgbochiume mkpi na mgbochiume nge

Mgbochiume mkpi(diagraph) – CH, GB, GH, GW, KP,

KW, NW, NY, SH. Ha di itoolu(9)

Mgbochumenge(single) - B, D, F, G,H, J, K, L, M, N, N

P, R, S, T, V, W, Y, Z. Ha di iri na itoolu(19)

NNWALE

Gosipute uzo ole udaume kere onwe ya?

Guputa mgbochiume nge e nwere

MYIRIUDAUME NA AKARA EDEMEDE

NDINAYA

MYIRIUDAUME

Nke a bu oge ‘m’ na ‘n’ na-aru oru dika udaume.Nke a na-adi ire oge ‘m’ ma o bu ‘n’ nodebere
mgbochiume n’okwu Igbo. Ima atu--

Mmanu Mma Nnunu mbe mgba mpe

Nkita Mmiri Mkpuke ndo njo nte

Nri Mgbe Nso nge nku ncha


EBE “M na N” NA ARU ORU DI KA MGBOCHIUME

Mgbochiume “M na N” na- egosiputa mgbe M na N anaghi enwe uda ma ha kwuru onwe ha. M
na N a naghi enwe uda, naani ma a agbakwunyere ha mkpuruedemede udaume.

Omumaatu

Maka Nata muta Naani

Mere Nari Napuru Nara

Metara Muo Muta Muru

AKARA EDEMEDE

NDINAYA-

Akara edemede bu akara ndi ahu na-enye aka ime ka ogugu asusu igbo gaa were,were ma
nwekwa nghota zuruoke.Akara edemede e nwere bu-

Akara Igbo Bekee

a, . kpom fullstop

b, , Rikom comma

c, ‘ Rikomelu Apostrophe

d, ? Akara ajuju Question mark

e, ! Akara ntimkpu Exclamation

f, : Kpomkpom Colon

g, - Akarauhie Hyphen

h, () Akarangudo bracket

I “ “ akarangwu inverted comma

NNWALE

Depute ebe ‘m na-aru oru dika myiriudaume ise?

Gosi ebe ‘n’ na-aru oru dika mgbochume ise?

ORU ULO
1Otu n’ime ndi a bu udaume--------(a)ny (b)p (c)u (d)m

2Okwu nwere myiriudaume n’ebe a bu -----(a)maka (b)noro (c)nti (d)ube

3Akara edemede a na-etinye ebe a juru ajuju bu?--------(a)kpom (b)akara ntimkpu (c)rikom
(d)akara ajuju

4Udaume Igbo di ole?-------(a)asato (b)iri (c)iri asato (d)abuo

5 Myiriudaume Igbo bu?-------(a)d na n (b)m na n (c)h na d (d)o na z.

TIORI

Depute okwu ise ise ebe m na n na-aru oru dika myiriudaume

IZU NKE ASAA (WEEK 7) UBOCHI

ISIOKWU Nrukorita oru na uru o bara

NDINISIOKWU

(i)nkowa Nrukorita oru

(ii)Nkowa usoro na iwu nrukorita oru

(iii)uru na oghom di na nrukorita oru

NKOWA IHE BU NRUKORITA ORU

NDINAYA

Nke a bu mmadu na ibe ya inoro n’out ulo oru na arukorita oru. N’ulo oru di iche iche a
na-adi otutu mmadu na-arukorita oru.N’ulo oru ufodu o na-abu naanni umu nwoke. N’
ufodu, ya aburu nani umu nwaani na-arukorita oru.

EBE NANI UMU NWOKE NA ARU ORU;-Ima atu

i. N’ulo oru ebe a na-egwupute koolu

ii. Ndi na-aru ulo

iii. ndi na-aru akwa mmiri

iv. Ndi na-ahu maka oku latiriki


v. Ebe a na-egwupute aga nime mmiri

EBE NANI UMU NWANYI ARU ORU;

I. Ebe a na-azu nwanyi na-agho nnwa.

ii. Ebe ana azu umu aka enweghi nne na nna

Ebe nwokena nwanyi na arukorita oru

i. Ebe a na-akuzi nkuzi

ii. N’ulo aku

iii. N’ulo ogwu (Dibia bekee)

iv. Ebe a na-agba boolu

v. Ebe a na-akwua akwu (jaloring)

vi. Ebe a na-azu ahia

vii. Ebe a na-ogu egwu

viii. Oru uwe ojii na soja

NWALE

i. Depute ulo oru ato ebe nani ndi n woke na-arukorita oru

ii. Dee ulo ulo oru ano ebe umu nwoke na nwayi na-arukorita oru

- Uru na oghom din a nrukorita oru;

NDINAYA

uru di na nrukorita oru bu…………

I. O na- eme ka oru di mfe

II. O na-ewete obi anuri

iii. O na-ewete agbambo

iv O na-ewete idi uchu


v. O na-ewete mmekorita mmadu na ibe ya

Oghom di na nrukorita orubu…………..

i. O na-ebute akpomasi

ii. O na-ewete ufu anya

iii. O na-ebute ogba aghara

iv. O na ewete idoghachi ulo oru azu

Nnwale

i. Depute uru ato di na nrukorita oru

ii. Dee oghom a na-ewete na nrukorita oru

Ihe ogugu:- Igbo maka junio sekondiri i. ihe akwukwo nke iri ise na ise.

Oru Ulo

i. Otu n’ime ndi abu ebe nani umu nwanyi na-aru oru……………. (a) N’ulo aku (b) N’ulo
ogwu (c) Ebe a na-azu umuaka eweghi nne (d) Ebe a na-azu ahia

ii. Nani ebe umu nwoke na-aru oru bu otu n’ime ndi a (a) Ebe a na-egwupute aja (b) Ebe a
na-agho nnwa

(c) Ebe a na akuzi nkuzi (d) Oru uwe ojii

iii. Oru umu nwoke na nwanyi na-arukorita oru bu otu n’ime ndi a … (a) Oru idozie latriki

(b) Oru uwe ojii (c) oru igho nnwa (d) Oru iru ulo

iv. Otu n’ime ndi a bu uru nrukorita oru … (a) O na-ebute akpomasi (b) O na-ewete ufuanya
(c) O na-ewete idi uchu (d) O-na ewete ogbaghara

v. Gosi nke bu oghom di na nrukorita oru (a) O na-ewete idi uchu (b)O na-ebute ufu anya
(c) O na-ewete mmekorita (d) O na-ewete obi anuri

Toiri

i. Gini bu nrukorita oru?


ii. Depute uru na oghom ise ise di na nrukorita or

IZU NKE ASATO (WEEK8) UBOCHI

ISIOKWU---- Ahirimfe

:NDINISIOKWU

ISIOKWU :-mmebe ahiriokwu (ahirimfe) nkwe na nke nju

NDINISIOKWU

- Ihe bu ahiriokwu na udidi ya nkowa

- ihe bu ahirimfe

- Nkwe na nke nju

IHE BU AHIRIOKWU

Ahiriokwu bu okwu ole na ole gara n’ezigbo usoro ma nwee nghota. O ga-enweriri ngwaa. E
nwere udidi Ahiriokwu di rihe rehe. Ha bu:-

Ahirimfe - simple sentence

Ahirinha Compound “

Ahiriukwu Complex “

Ahirimgbagwo Compound complex sentence

NNWALE.

I. Gini bu ahiriokwu?

ii. Depute udidi ahiriokwu ato i maara..

iii. Mebe ahiriokwu ato.


NKOWA IHE BU AHIRIMFE

NDINAYA.

Nke a bu ahiriokwu nwere nani out ngwaa ima atu:-

Eze fere ofe

Nneka gbara oso

Ude bere akwa

Ahirinkwe – (Affirmative sentence).

Nke a bu ahiriokwu na-egosi nkwenye, nnabata, nkwado na enweghi mgbagha n’ihe a na-ekwu
maka ya.

Ahirinju – (Negative sentence) Nke a bu ahiriokwu na-agbagha na ekwugide ju ikwenye n’ihe o


na-ekwu maka ya.

Omumatu.

Ahiri nkwe Ahirinju

Okeke jere ahia Okeke ejeghi ahia

Ha ga-abia echi Ha agaghi abia echi.

Uche tere ofe Uche eteghi ofe

Ha gbara oso Ha agbaghi oso.

O gwuru mmiri O gwughi mmiri

Ha bere akwa Ha ebeghi akwa

Ngozi chiri ochi Ngozi achighi ochi.


NNWALE.

i. Gini bu ahirimfe?

ii. Depute ahirinkwe abuo?

iii. Nye omumatu ahiri nju ato?

IHE OGUGU: IGBO MAKA JUNIO SEkONDIRI.

ORU ULO.

1 Ahirimfe na-enwe ………………….ngwaa. (a) ot (b) abuo (c ) ato (d) ano

2. Ahiriokwu ga-enweriri ………………na ngwucha. (a) rikom (b) kpom (c ) kpon kpon (d)
akara ntinkpu

3. Ihe na-akwusi ahirinju bu………………..(a) la (b) na (c ) ghi (d) so

4. Mebe ahirinju ato

You might also like